Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Luk 2:4 - Bible Nso

4 Josef we si kwa na Galili, site n'obodo Nazaret, rigo na Judia, ba n'obodo Devid nke anākpọ Betlehem, n'ihi na o si n'ulo na agburu Devid puta;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Luk 2:4
24 Iomraidhean Croise  

Rechel we nwua, elìe ya n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).


Ma mu onwem, mb͕e m'siri na Padan bia, Rechel nwuru n'akukum n'ala Kenean n'uzọ, mb͕e uzọ foduru ibiaru Efrat: m'we lìe ya n'ebe ahu n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).


Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ.


we bia biri n'obodo anākpọ Nazaret: ka okwu ekwuru site n'ọnu ndi-amuma we mezu, na agākpọ Ya Onye Nazaret.


Madu nile we ga ka ede aha-ha n'akwukwọ, onye ọ bula ọ ga obodo nke aka ya.


ka o we me ka ede aha ya na Meri n'akwukwọ, bú nwanyi ekwere na ọ gālu, onye di kwa ime.


O we bia rue Nazaret, ebe azuputara Ya, O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, dika Ọ nēme mb͕e dum, O we bilie igu akwukwọ.


Nataniel we si ya, Ọ̀ di ezi ihe ọ bula puru isi na Nazaret puta? Filip si ya, Bia le.


Àkwukwọ nsọ ekwughi na Kraist-ayi nēsi na nkpuru Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntá ebe Devid nọri?


Ha abua we n=eje rue mb͕e ha bara Bet-lehem. O rue, mb͕e ha bara Bet-lehem, na obodo ahu nile b͕ara aghara bayere ha, ndinyom we si, #_O bu Naomi, b/u nka?


Ma, le, Boaz siri na Bet-lehem bia, si ndi n=eb#i ọka, Jehova nọyere unu. Ha we si ya, Jehova gọzie gi.


Ndi nile ndi nọ n>ọnu-uzọ-ama na ndi-okenye we si, Ndi-#am#a ka ayi bu. Jehova me nwayi a nke n=ab#a n>ulo-gi ka ọ di ka Rechel na dika Lea, ndi ha abua wuru ulo Israel: gi me kwa d#inkp#a n>Efrata, me ka amara aha-gi na Bet-lehem:


Ndinyom, b/u ndi-ab͕ata-obi-ya, we kpọ ya aha, si, Amuru nwa-nwoke nye Naomi; ha we kpọ aha-ya Obed: onye ahu bu nna Jesi, nna Devid.


Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom.


Samuel we me ihe ahu nke Jehova kwuru, ọ biarue Bet-lehem. Ndi-okenye obodo ahu we ma jijiji izute ya, si, Ọ̀ bu n'udo ka i biaworo?


Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n'etiti ndikom n'ubọchi Sọl.


Sọl we si ya, Nwà onye ka i bu, gi nwa-okorọbia? Devid we si, Nwa orù-gi, bú Jesi, bú onye Bet-lehem, ka m'bu.


Ọ buru na nna-gi ele anyam ma-ọli, i gāsi kwa, Devid riọsirim ike ka m'rapu ya ka ọ b͕a ọsọ je Bet-lehem, bú obodo-ya: n'ihi na àjà arọ diri ab͕uru-ya nile n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan