Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike.
Ma n'arọ nke-iri-na-ise n'ọchichi nke Taibiriọs Sisa, mb͕e Pọntiọs Pailat bu onye nāchi Judia, mb͕e Herod bu kwa tetrarch nke Galili, mb͕e nwa-nne-ya Filip bu kwa tetrarch nke ala Ituria na Trakonaitis, mb͕e Lisanias bu kwa tetrarch nke Abilini,
Mb͕e onye ahu gasiri Judas onye Galili biliri n'ubọchi odide-aha, me kwa ka ufọdu n'etiti ndi-Ju so ya n'azu: onye ahu la-kwa-ra n'iyì; ewe chusa ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya.