Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Luk 17:2 - Bible Nso

2 Ọ gakara ya-ri mma ma akwuba ya nkume-igwe-nri n'olu, tubà kwa ya n'oké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n'ọnyà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Luk 17:2
13 Iomraidhean Croise  

Dika onye-ọzùzù-aturu ka Ọ gāzù ìgwè aturu-Ya, n'ogwe-aka-Ya ka Ọ gāchikọta umu-aturu, ọ bu kwa n'obi-Ya ka O gēkuru ha, Ọ gēwere nwayọ nēdu ndi nēnye umu ara.


Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M'gēchighari kwa akam imegide ndi ntà.


Ma, ka ayi we ghara ime ka ha ma n'ọnyà, ga rue oké osimiri, tubà nko-azù, were azù nke buru uzọ puta; mb͕e i saghesiri ọnu-ya, i gāhu kwa otù shekel: were nke ahu, nye ha ka ọ buru nke Mu na gi.


Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n'ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n'elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.


Otú a ọ bughi ihe achọrọ n'iru Nna-unu Nke bi n'elu-igwe, ka otù nime ndi ntà ndia la n'iyì.


Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ bayere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye. Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.


Ọzọ, onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwerenu ka ọ ma n'ọnyà, ọ gāka ya nma ma ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, tubà ya n'oké osimiri.


Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri.


Ma mu onwem, ejighm ihe ọ bula n'ihe ndia nara ihe: edeghi m kwa ihe ndia n'akwukwọ ka ewe me otú a n'ebe m'nọ: n'ihi na ọ kam nma ka m'nwua, kari ka onye ọ bula me ka ihe-inya-isim buru ihe-efu.


N'ebe ndi nādighi ike nọ m'ghọrọ onye nādighi ike, ka m'we rita ndi nādighi ike n'urù: aghọwom ihe nile n'ebe madu nile nọ, ka m'we si n'uzọ ọ bula zọputa ufọdu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan