Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Luk 10:9 - Bible Nso

9 mekwanu ndi aru-ha nādighi ike nọ n'ebe ahu ka aru-ha di ike, si-kwa-nu ha, Ala-eze Chineke di unu nso.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Luk 10:9
15 Iomraidhean Croise  

Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.


si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.


Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.


O we si, Ayi gēsi aṅa tunyere ala-eze Chineke? ma-ọbu n'ìlu gini ka ayi gātu ya?


Ha nāchupu kwa ọtutu mọ ọjọ, were kwa manu olive te ọtutu ndi-nriaria, we me ka aru di ha ike.


Ma nime obodo ọ bula unu gābà, ma ha anaraghi unu nke-ọma, puanu n'amá-ya, si,


Ọbuná ájá si n'obodo-unu, nke rakuru n'ukwu-ayi, ka ayi nēhichapu imegide unu: otú ọ di, maranu nka, na ala-eze Chineke di nso.


O we zipu ha ikwusa ala-eze Chineke, na ime ka aru di ndi-nriaria ike.


Jisus zara, si ya, N'ezie, n'ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya.


Jisus zara, N'ezie, n'ezie, asim i, Ọ buru na amughi madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pughi ibà n'ala-eze Chineke.


Ya mere maranu, na nzọputa nka, bú nke Chineke, ka ezigara ndi mba ọzọ: ndi ahu gānu kwa.


nēkwusa ala-eze Chineke, nēwere kwa nkwuwa-okwu nile zí ihe nile bayere Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ọ dighi onye nēb͕ochi ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan