Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Luk 10:4 - Bible Nso

4 Unu ewela àkpà-ego, ma-ọbu àkpà-ije, ma-ọbu akpukpọ-ukwu: unu ekele-kwa-la onye ọ bula n'uzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Unu ewerekwala ego maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ. Unu ekelekwala onye ọbụla nʼụzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Luk 10:4
13 Iomraidhean Croise  

Ewe dọba nri n'iru ya iri: ma ọ siri, M'gaghi-eri, rue mb͕e m'gēkwuwori okwum nile. Ọ si, Kwue.


Ọ si ha, Unu eb͕ochilam, ebe Jehova meworo ka uzọm ga nke-ọma; zilagam ka m'lakuru onye-nwem.


O we jikwa inyinya-ibu, si nwa-okorọbia-ya, Nēdu, nēje kwa; eb͕ochilaram inyinya-ibu n'ibum b͕a ọsọ, ma ọ buru na asighm i.


O we si Gihezi, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were kwa nkpa-n'akam n'aka-gi, je: mb͕e i zutere nwoke ọ bula, ekelela ya; mb͕e nwoke ọ bula gēkele gi, azala ya: tukwasi nkpa-n'akam n'iru nwa-okoro ahu.


Ka anya-gi abua legide n'iru, Ka mbubere-anya-gi lezi kwa n'iru gi.


Ọ we kpọ ndi-ozi iri na abua ahu biakute Ya, O we malite izipu ha abua abua; O nye-kwa-ra ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ;


O we si ha, Mb͕e M'zipuru unu nējighi àkpà-ego, na àkpà-ije, na akpukpọ-ukwu, ọ̀ di ihe kọrọ unu? Ha si, Ọ dighi ihe kọrọ ayi.


Devid we si Ahimelek, Ọ̀ dighi kwa ube ma-ọbu mma-agha di n'ebe a n'okpuru aka-gi? n'ihi na ewetaghm ma mma-agham ma ihe-agham, n'ihi na okwu a nke eze bu ihe di ọku ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan