Ejiri okwu-ọnu zí nwoke a uzọ Onye-nwe-ayi; ebe ọ di ọku na mọ-ya, o we nēkwu nēzí kwa nke-ọma ihe nile bayere Jisus, ọ bu ezie na ọ mara nání baptism nke Jọn:
otú ọ di, nime nzukọ Kraist anamachọ ka m'ji uchem kwu nkpuru okwu ise, ka m'were okwu-ọnum zí kwa ndi ọzọ ihe, kari ikwu orú nnù okwu na nnù ise n'asusu di iche.