12 Mb͕e Zakaraias huru ya obi we lọ ya miri, ọ tu-kwa-ra egwu.
12 Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu.
Gideon we hu na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu; Gideon we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ihi na ahuwom mọ-ozi nke Jehova iru n'iru.
Manoa we si nwunye-ya, Ayi aghaghi inwu, n'ihi na ọ bu Chineke ka ayi huworo.
Mb͕e m'huru Ya, m'we da n'ala n'ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu,
O we legide ya anya, tu kwa egwu, si, Ọ̀ bu gini, Onye-nwe-ayi? Ọ si ya, Ekpere-gi nile na ọlu ebere gi nile rigoro ibu ihe-ncheta n'iru Chineke.
Ma obi lọrọ ya miri nke-uku n'okwu-ya, o we nātule n'uche-ya aha ekele okwu a gābu.
Ha we ba n'ílì, hu nwa-okorọbia ka ọ nọduru n'aka-nri, b͕okwasi kwa uwe-nwuda ọcha; ibobo we nwua ha n'aru nke-uku.
Mu onwem, bú Daniel, náním, huru ọhù ahu: ma ndikom ahu ndi mu na ha nọ ahughi ọhù ahu; ma otù ọ di, oké ọma-jijiji dakwasiri ha, ha we b͕alaga izobe onwe-ha.