Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 9:4 - Bible Nso

4 Ayi aghaghi ilu ọlu Onye ziterem, mb͕e ubọchi fọduru: abali nābia, mb͕e ọ dighi onye ọ bula puru ilu ọlu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 9:4
18 Iomraidhean Croise  

Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.


Ha si ya, N'ihi na ọ dighi onye ọ bula goro ayi ilu ọlu. Ọ si ha, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem.


O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, puta n'etiti.


Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume?


Ọ buru na alughm ọlu Nnam, unu ekwelam.


Ya mere Jisus siri ha, Nwa oge fọduru ka Ìhè ahu gādi n'etiti unu. Nējegharinu mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, ka ọchichiri ghara ijide unu: onye nējeghari n'ọchichiri adighi-amata ebe ọ nēje.


Mu onwem nyere Gi otuto n'elu uwa, ebe M'luzuru ọlu I nyeworom ka M'lua.


Jisus si ha, Ihe-oririm bu ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'luzu kwa ọlu-Ya.


Ya mere Jisus zara, si ha, N'ezie, n'ezie asim unu, Ọkpara apughi ime ihe ọ bula n'Onwe-ya, ma-ọbughi ihe Ọ huru na Nna-Ya nēme: n'ihi na ihe ọ bula Ya onwe-ya nēme, ndia ka Ọkpara-Ya nēme kwa otú ahu.


Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom.


Ya mere Jisus siri, Ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ, M'we lakuru Onye ziterem.


n'ihi na ayi onwe-ayi apughi ighara ikwu ihe nile ayi huru nu kwa.


Ya mere otú a, otú ayi nwere oge, ka ayi nālu ezi ihe n'ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n'ebe ndi èzí-na-ulo nke okwukwe-ayi nọ.


nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ.


Nējegharinu n'amam-ihe n'ebe ndi nọ n'èzí nọ, nāzuchapuru onwe-unu oge a nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan