26 ya mere ha siri ya, Gini ka O mere gi? Ò si aṅa meghe anya-gi?
26 Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?”
Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.
Ha we jua Beruk, si, Biko, gosi ayi, Ì siri aṅa deputa okwu ndia nile n'ọnu-ya?
Ma ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we hu ihe ha gēji bo Ya ebubo.
Ya mere ha nāsi ya, Èsi kwa aṅa meghe anya-gi?
Ya mere ndi-Farisi ju-kwa-ra ya ọzọ otú emere ọ hu uzọ. Ọ si ha, Ọ tukwasiri ájá n'anyam abua, m'we sa miri, nāhu kwa uzọ.
Ya mere onye ahu zara, si, Ma Ọ bu onye-nmehie, amataghm: otù ihe ka m'matara, na, ebe m'kpururi ìsì, ub͕u a anamahu uzọ.
Ọ zara ha, si, Agwaram unu ọbuná ub͕u a, ma unu anugh: gini mere unu nāchọ inu ya ọzọ? ùnu onwe-unu nāchọ kwa ighọ ndi nēso uzọ-Ya?