Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 9:24 - Bible Nso

24 Ya mere ha kpọrọ onye ahu nke ub͕ò abua, bú onye kpururi ìsì, we si ya, Nye Chineke otuto: ayi onwe-ayi matara na Nwoke a bu onye-nmhie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 9:24
22 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a nyenu Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, ekele, me kwa ihe nātọ Ya utọ: kewaputa-kwa-nu onwe-unu n'aru ndi di iche iche nke ala nka, na n'aru ndinyom ala ọzọ.


Nurunu okwu Jehova, unu ndi nama jijiji n'okwu-Ya: Umu-nne-unu ndi nakpọ unu asì, ndi nāchupu unu n'ihi aham, asiwo, Ka asọpuru Jehova, ka ayi we lekwasi ọṅù-unu anya: ma ihere gēme ndi ahu.


Ha kpọgide-kwa-ra ndikom abua tinyere Ya ndi nāpunara madu ihe; otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe-Ya.


Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we nātamu, si Nwoke a nānara ndi-nmehie nke-ọma, nēso kwa ha eri ihe.


Mb͕e ha huru ya, ha nile we nātamu, si, Ọ bàra inọ ọnọdu-abali n'ulo nwoke bu onye-nmehie.


Ma mb͕e onye-Farisi nke kpọrọ Ya huru ya, o kwue n'onwe-ya, si, Nwoke a, asi na Ọ bu onye amuma, Ọ gāmara onye nwanyi a bu nke nēmetu Ya aka, na aha madu ọ bu, na ọ bu onye-nmehie.


Ọ dighi ọtutu okwu Mu na unu gēkwu ọzọ site n'ub͕u a, n'ihi na onye-isi nke uwa nka nābia: ọ dighi kwa ihe ọ bula o nwere nimem;


Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.


Ha zara, si ya, Ọ buru na Onye a abughi onye nēme ihe ọjọ, ayi agaghi-ararawori Ya nye n'aka-gi.


Ya mere mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi nēje ozi huru Ya, ha tie nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, Unu onwe-unu were Ya, kpọgide kwa Ya n'obe: n'ihi na mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmhie nime Ya.


ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya.


Ònye nime unu turum nmehie n'anya? Ọ buru na M'nēkwu ezi-okwu, n'ìhi gini ka unu onwe-unu nēkweghm?


Jisus zara, si, Mu onwem enweghi mọ ọjọ; kama anamasọpuru Nnam, unu onwe-unu nēmekwam ihe-ihere.


Ya mere ufọdu n'etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n'ebe Chineke nọ, n'ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n'etiti ha.


Ya mere onye ahu zara, si, Ma Ọ bu onye-nmehie, amataghm: otù ihe ka m'matara, na, ebe m'kpururi ìsì, ub͕u a anamahu uzọ.


N'ihi na ihe iwu ahu nāpughi ime, nke ọ nādighi ike nime ya site n'anu-aru, Chineke mere, n'ihi na Ọ mara nmehie ikpé n'anu-aru, mb͕e O zitere Ọkpara nke aka Ya n'oyiyi nke anu-aru nmehie na dika àjà achuru n'ihi nmehie:


Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.


Joshua we si Ekan, Nwam, biko, nye Jehova, bú Chineke Israel, nsọpuru, nye kwa Ya ekele; biko, gosikwam ihe i meworo; ezopula ya n'ebe m'nọ.


N'otù oge hour ahu oké ala-ọma-jijiji we da, otù uzọ n'uzọ iri nke obodo ahu we da rue ala; ewe b͕ue nnù madu iri na nnù asa na ọgu iri nime ala-ọma-jijiji ahu, bú ndi nwere aha: ndi fọduru we tua egwu, ha we nye Chineke nke elu-igwe otuto.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan