Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 9:22 - Bible Nso

22 Ihe ndia ka ndi muru ya kwuru, n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na ndi-Ju kwekọrọri n'etiti onwe-ha ub͕u a, ka esi n'ulo-nzukọ chupu onye ọ bula, ma ọ buru na ọ gēkwuputa na Ọ bu Kraist.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nʼihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị kpebirila na ọ bụrụ na onye ọbụla ekwuo na Jisọs bụ Kraịst ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nʼụlọ ekpere ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 9:22
24 Iomraidhean Croise  

Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia;


Genum nti, unu ndi mara ezi omume, bú ndi ahu nke iwum di n'obi-ha; unu atula egwu ita-uta madu, unu atu-kwa-la ujọ nkwulu nile ha.


Ma ònye ka i cheb͕uworo onwe-gi bayere ya, we tua egwu ya, na i nēkwu okwu-ugha, we ghara ichetam, ghara kwa itiye ya n'obi-gi? Mù onwem adighi-ab͕a nkiti ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, i we ghara itu egwum?


Ngọzi nādiri unu, mb͕e ọ bula madu gākpọ unu asì, mb͕e ọ bula ha gēkewapu kwa unu, ta kwa unu uta, tufu kwa aha-unu dika ajọ ihe, n'ihi Nwa nke madu.


Nka bu kwa àmà Jọn, mb͕e ndi-Ju siri na Jerusalem zigara ya ndi-nchu-àjà na ndi Livai ka ha jua ya, si, Gì onwe-gi bu onye?


Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.


Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Josef nke Arimatia, ebe o nēso uzọ Jisus, ma na nzuzo n'ihi egwu ndi-Ju, o kpere Pailat ka o bupu aru Jisus: Pailat we kwere ya. Ya mere ọ biara, bupu aru-Ya.


Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n'ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n'ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n'ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu.


Otú ọ di, ọ dighi onye ọ bula nēkwuwa okwu bayere Ya n'ihi egwu ndi-Ju.


Ya mere ndi-Ju ekweghi okwu bayere ya, na o kpururi ìsì, na eme-kwa-ra ya ka ọ hu uzọ, rue mb͕e ha kpọrọ ndi muru onye ahu emere ka ọ hu uzọ,


ma otú ọ nāhu uzọ ub͕u a, ayi amataghi; ma-ọbu onye meghere anya-ya, ayi onwe-ayi amatagh: juana ya; o ruwo dìnkpà; ya onwe-ya gēkwuru onwe-ya.


Ha zara, si ya, Amuru gi onwe-gi nime nmehie, ọ̀ bu gi onwe-gi nēzí kwa ayi ihe? Ha we chupu ya n'èzí.


Jisus nuru na ha chupuru ya-ri n'èzí; O we chọta ya, si, Gì onwe-gi kwere n'Ọkpara Chineke?


Ha we kpọ ha, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu ma-ọli ma-ọbu izí ihe n'aha Jisus.


Ma nime ndi fọduru ọ dighi onye ọ bula nwere anya-ike iwere onwe-ya rapara ha n'aru: otú ọ di, ndi-Ju nēme ka ha di uku;


Ha we kweyere ya: mb͕e ha kpọsiri ndi-ozi biakute ha, ha pia ha ihe, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n'aha Jisus, ha we rapu ha ka ha la.


Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan