Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 9:16 - Bible Nso

16 Ya mere ufọdu n'etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n'ebe Chineke nọ, n'ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n'etiti ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.” Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 9:16
18 Iomraidhean Croise  

ma le, otù nwoke nke nwere aka kpọnwuru akpọnwu. Ha we jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike? ka ha we bo Ya ebubo.


Ma ndi-Farisi, mb͕e ha huru ya, ha si Ya, Le, ndi nēso uzọ-Gi nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike.


Ma onye-isi ulo-nzukọ ahu, ebe iwe were ya nke-uku n'ihi na Jisus mere ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ọ zara, si ìgwè madu ahu, Ubọchi isi di nke madu aghaghi ilu ọlu nime ha: ya mere, bianu nime ha ka eme ka aru-unu di ike, unu abiakwala n'ubọchi-izu-ike.


Nkewa putara ọzọ n'etiti ndi-Ju n'ihi okwu ndia.


Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bughi, kwerenum n'ihi ọlum onwe-ha.


Ọ buru na alughm ọlu n'etiti ha nke onye ọzọ nālughi, ha agaghi-enwewori nmhie: ma ub͕u a ha ahuwo kpọ kwa Mu na Nnam asì.


Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.


Onye ahu biakutere Ya n'abali, si Ya, Rabai, ayi matara na I bu onye-ozizí Nke siworo n'ebe Chineke nọ bia: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru ime ihe-iriba-ama ndia nke Gi onwe-gi nēme, ma ọ buru na Chineke anọyeghi ya.


Ya mere ndi-Ju nāsi onye ahu emere ka aru-ya di ike, Ọ bu ubọchi-izu-ike, o zighi kwa ezi n'iwu ka i chiri ute-gi.


Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom.


Ya mere ndi-Ju nālurita uka n'etiti onwe-ha, si, Onye a, Ò si aṅa pu inye ayi anu-aru-Ya ka ayi rie?


Oké ntamu di kwa n'etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a.


Ọ buru na ebì madu úgwù n'ubọchi-izu-ike, ka ewe ghara imebi iwu Moses; ùnu nwere òlùlù ọjọ n'arum, n'ihi na emerem ka aru dichasia otù madu nma n'ubọchi-izu-ike?


Ya mere nkewa putara n'etiti ìgwè madu ahu n'ihi Ya.


Ya mere ha kpọrọ onye ahu nke ub͕ò abua, bú onye kpururi ìsì, we si ya, Nye Chineke otuto: ayi onwe-ayi matara na Nwoke a bu onye-nmhie.


Ma ọra obodo ahu kewara: ufọdu we nọ n'akuku ndi-Ju, ufọdu nọ kwa n'akuku ndi-ozi Jisus.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan