14 Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi Jisus gwọrọ ájá, we meghe anya-ya.
14 Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya.
O rue, na Ọ nāga n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ndi nēso uzọ-Ya we malite ighọ oko ọka mb͕e ha nāga.
O rue, mb͕e Ọ batara n'ulo otù onye nime ndi-isi nke ndi-Farisi iri nri n'ubọchi-izu-ike, na ndi ahu nēche Ya nche.
N'ihi nka ka ndi-Ju nēsob͕u kwa Jisus, n'ihi na Ọ nēme ihe ndia n'ubọchi-izu-ike.
Ngwa ngwa ewe me ka aru di nwoke ahu nma, o we chiri ute-ya, we nējeghari. Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi ahu.
Ha kutara ndi-Farisi onye ahu nke kpuru ìsì n'oge gara aga.
Mb͕e O kwusiri ihe ndia, Ọ bua ọnu-miri n'ala, were ọnu-miri ahu gwọ ájá, were ájá ahu te n'anya-ya abua,