Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 8:52 - Bible Nso

52 Ndi-Ju siri Ya, Ub͕u a ka ayi mara na I nwere mọ ọjọ. Abraham nwuru, na ndi-amuma; ma Gi onwe-gi nāsi, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

52 Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 8:52
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Jọn biara nērighi ihe-oriri nāṅughi kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, O nwere mọ ọjọ.


Nka bu kwa àmà Jọn, mb͕e ndi-Ju siri na Jerusalem zigara ya ndi-nchu-àjà na ndi Livai ka ha jua ya, si, Gì onwe-gi bu onye?


Jisus zara, si ya, Ọ buru na madu ahum n'anya, ọ gēdebe okwum: Nnam gāhu kwa ya n'anya, Ayi gābiakute kwa ya, nēme kwa ebe-obibi-Ayi n'ebe ọ nọ.


Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu.


Emerem ka aha-Gi puta ìhè nye ndi I nyerem site 'uwa: Gi onwe-gi nwere ha, I were kwa ha nyem; ha edebewo kwa okwu-Gi.


Ìgwè madu ahu zara, si, I nwere mọ ọjọ: ònye nāchọ uzọ ib͕u Gi?


Ya mere ndi-Ju nāsi, Ò gēb͕u Onwe-ya, na Ọ nāsi, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia?


Ndi-Ju zara, si Ya, Àyi onwe-ayi ekwughi nke-ọma, si na Gi onwe-Gi bu Onye Sameria, I nwe-kwa-ra mọ ọjọ?


N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-ahu ọnwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.


unu amaghi kwa Ya; ma Mu onwem matara Ya; ọ buru kwa na agamasi, Amataghm Ya, M'gēyi unu, buru onye-ugha: ma amataram Ya, nēdebe kwa okwu-Ya.


Ya mere ha kpọrọ onye ahu nke ub͕ò abua, bú onye kpururi ìsì, we si ya, Nye Chineke otuto: ayi onwe-ayi matara na Nwoke a bu onye-nmhie.


Ndia nile nwuru n'uzọ okwukwe, ebe ha anataghi nkwa ahu, kama ha huru ha-ri, si kwa n'ebe di anya kele ha, we kwuputa na ha bu ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa n'elu uwa.


Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n'isi dika okpu-eze n'ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n'amara Chineke detu ọnwu ire n'ihi madu nile ọ bula.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan