Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 8:39 - Bible Nso

39 Ha zara, si Ya, Nna-ayi bu Abraham. Jisus si ha, Ọ buru na unu bu umu Abraham, unu gālu ọlu Abraham.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

39 Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 8:39
13 Iomraidhean Croise  

unu echè-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.


ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n'elu-igwe: n'ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume.


Ha zara Ya, si, Ayi bu nkpuru Abraham, ọ kādighi kwa mb͕e ọ bula ayi bu orù onye ọ bula: Gì onwe-gi si aṅa kwu, Agēme ka unu pua n'orù?


Amataram na unu bu nkpuru Abraham; ma unu nāchọ uzọ ib͕um, n'ihi na okwum enweghi ọnọdu nime unu.


N'ìhi gini ka unu nāmaghi ihe M'nēkwu? Ọ bu n'ihi na unu apughi inu okwum.


Obi tọrọ nna-unu Abraham utọ nke-uku ihu ub͕ọchim; o we hu ya, ṅuri kwa ọṅu.


ka o we buru kwa nna nke obibì-úgwù n'ebe ndi ahu nọ, bú ndi nābughi nání ndi sitere n'obibì-úgwù, kama ha nēsozi kwa ije-ukwu nke okwukwe ahu nke nna-ayi Abraham, nke o nwere n'ebìghi-úgwù.


N'ihi nka o sitere n'okwukwe, ka o we di ka amara si di; ka nkwa ahu we guzosie ike n'ebe nkpuru ahu nile nọ; ọ bughi nání ndi sitere n'iwu ahu, kama ọ bu kwa ndi sitere n'okwukwe Abraham, onye bu nna nke ayi nile.


ọ bughi kwa ha nile bu umu, n'ihi na ha bu nkpuru Abraham: kama, Nime Aisak ka agākpọ nkpuru-gi aha.


Ma ọ buru na unu onwe-unu bu ihe di n'aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwa si di.


Ya mere maranu na ndi sitere n'okwukwe, ndi ahu bu umu Abraham.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan