Ọtutu ndi di iche iche gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, rue ulo Chineke nke Jekob; O gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n'okporo-uzọ-Ya nile: n'ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta.
Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n'ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n'uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu.
Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;
Otú a ka Jehova siri, Guzonu n'uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.
Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.
Ma unu ndi nātu egwu aham ka anyanwu nke ezi emume gāwara, ọgwugwọ di kwa na nkù; unu gāpu kwa, wulie elu dika umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba.
Nyaranu yoke nkem n'olu-unu, muta-kwa-nu ihe n'ọnum; n'ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n'obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu.
Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.
Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n'ezi-okwu nile: n'ihi na Ọ gaghi-ekwu n'Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia.
Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem.
Ma ub͕u a ebe unu pusiri na nmehie nwere onwe-unu, ghọ kwa ndi-orù nke Chineke, unu nwere nkpuru-unu nēweta ido-nsọ, unu nwe-kwa-ra ndu ebighi-ebi dika ọgwugwu-ya.
N'ihi na onye akpọrọ nime Onye-nwe-ayi, mb͕e ọ bu orù, ọ bu onye Onye-nwe-ayi mere ka o nwere onwe-ya: otú a onye akpọrọ, mb͕e o nwere onwe-ya, ọ bu orù Kraist.
N'ihi na unu onwe unu, umu-nnam, ka akpọrọ ka unu nwere onwe-unu; nání unu ewerela inwe-onwe-unu ahu nye ka ọ buru ihe anu-aru-unu gēji me ihe kama werenu ihunanya burita orù ibe-unu.
Ma onye nyochaworo nime iwu zuru okè, bú iwu nke inwe-onwe-ya, nke nānọgide kwa otú a, ghara ighọ onye nānu anu nke nēchezọ, kama ọ bu onye nēme eme nke nālu ọlu, onye a gābu onye-ngọzi n'omume-ya.
Okenye nēdegara nwanyi-nwe-madu, bú onye arọputaworo, akwukwọ, ya na umu-ya, ndi mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu; ọ bughi kwa nání mu onwem, kama ọ bu kwa ndi nile ndi maworo ezi-okwu ahu;