rue mb͕e m'biara chiri unu je n'ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine, ala manu olive na manu-aṅu, ka unu we di ndu, ghara inwu: unu ege-kwa-la Hezekaia nti, mb͕e ọ nārafu unu, si, Jehova gānaputa ayi.
Ma ub͕u a unu ekwela Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a, unu ekwe-kwa-la ya: n'ihi na ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbu ala-eze ọ bula puru inaputa ndi-ya n'akam, ma-ọbu n'aka nnam-hà: n'ezie Chineke-unu agaghi-anaputa kwa unu n'akam.