Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 7:31 - Bible Nso

31 Ma n'etiti ìgwè madu ahu ọtutu kwere na Ya; ha nāsi kwa, Mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, Ọ̀ gēme ihe-iriba-ama kari nke Onye a mere?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 7:31
19 Iomraidhean Croise  

Ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile n'aru, ha we si, Nwoke a, Ọ̀ gābu nwa Devid?


Ndi nọ kwa n'oké nkume ahu bu ndi were ọṅù nara okwu ahu mb͕e ọ bula ha nuru ya; ma ndia enweghi nkpọrọgwu, ndi kwere na nwa oge, ma n'oge ọnwunwa ha wezuga onwe-ha.


Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju, ndi biakutere Meri, ndi le-kwa-ra ihe O mere, ha kwere na Ya.


n'ihi na ọ bu n'ihi ya ka ọtutu nime ndi-Ju nāpu, nēkwere kwa na Jisus.


Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ:


Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.


Onye ahu biakutere Ya n'abali, si Ya, Rabai, ayi matara na I bu onye-ozizí Nke siworo n'ebe Chineke nọ bia: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru ime ihe-iriba-ama ndia nke Gi onwe-gi nēme, ma ọ buru na Chineke anọyeghi ya.


Bianu, le otù Nwoke, Onye gwaram ihe nile m'mere: Ònye a gābu Kraist ahu?


Ma ọtutu ndi Sameria si n'obodo ahu kwere na Ya n'ihi okwu nwanyi ahu, onye b͕ara àmà, si, Ọ gwaram ihe nile m'mere.


Oké ìgwè madu we so Ya, n'ihi na ha huru ihe-iriba-ama di iche iche nke Ọ nēme n'aru ndi aru-ha nādighi ike.


Ma le, Ọ nēkwuwa okwu, ma ha agwaghi Ya okwu ọ bula. Ọ̀ gābu na ndi-isi mara n'ezie na Onye a bu Kraist-ayi?


Ya mere ufọdu n'etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n'ebe Chineke nọ, n'ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n'etiti ha.


Saimon onwe-ya we kwere kwa: mb͕e emesiri ya baptism, o we nọgidesi ike n'ebe Filip nọ; mb͕e ọ nāhu na anēme ihe-iriba-ama na oké ọlu di ike di iche iche, ibobo we nwua ya n'aru.


N'ihi na dika aru bu ihe nwuru anwu ma mọ adighi ya, ọbuná otú a okwukwe bu ihe nwuru anwu ma ọlu adighi ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan