O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku?
Ndi-Ju siri Ya, Ub͕u a ka ayi mara na I nwere mọ ọjọ. Abraham nwuru, na ndi-amuma; ma Gi onwe-gi nāsi, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.