Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 7:12 - Bible Nso

12 Oké ntamu di kwa n'etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 7:12
20 Iomraidhean Croise  

O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku?


Mb͕e ha nāchọ ijide Ya, ha we tua egwu ìgwè madu nile, ebe ha guru Ya n'onye-amuma.


si, Onye-nwe-ayi, ayi chetara na Onye-nduhie ahu siri, mb͕e Ọ nọ na ndu, Mb͕e ubọchi atọ gasiri M'gēsi n'ọnwu bilie.


Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke.


Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise huru ihe mere, o tobe Chineke, si, N'ezi-okwu Nwoke a bu onye ezi omume.


Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Josef, onye bu onye-nnọkọ-ikpé, ọ bu ezi nwoke buru kwa onye ezi omume,


Ezi madu site n'ezi àkù nke obi-ya nēweputa ezi ihe; ajọ madu site kwa n'ajọ àkù nke obi-ya nēweputa ajọ ihe: n'ihi na ọnu-ya nēkwu okwu site n'ihe nke obi nwebigara ókè.


Madu nile we tua egwu: ha we nye Chineke otuto, si, Onye-amuma uku ebiliwo n'etiti ayi: ha si kwa, Chineke eletawo ndi-Ya.


Ya mere mb͕e ndi ahu huru ihe-iriba-ama O mere, ha siri, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu nke nābia n'uwa.


Ndi-Farisi nuru ìgwè madu ahu ka ha nātamu ntamu ndia bayere Ya; ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi we ziga ndi nējere ha ozi ka ha jide Ya.


Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu?


Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie.


Ya mere ufọdu n'etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n'ebe Chineke nọ, n'ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n'etiti ha.


n'ihi na ọ bu ezi nwoke, juputa kwa na Mọ Nsọ na okwukwe: ewe tukwasi oké ìgwè madu nye Onye-nwe-ayi.


N'ihi na ọ di ike na otù onye gānwu n'ihi onye ezi omume: n'ihi na ma eleghi anya otù onye gēnwe anya-ike ọbuná inwu n'ihi ezi madu.


Menu ihe nile nējighi ntamu na iru-uka ọ bula;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan