Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 6:52 - Bible Nso

52 Ya mere ndi-Ju nālurita uka n'etiti onwe-ha, si, Onye a, Ò si aṅa pu inye ayi anu-aru-Ya ka ayi rie?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

52 Mgbe ahụ, ndị Juu bidoro na-arụrịta ụka ike nʼetiti onwe ha sị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị rie?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 6:52
11 Iomraidhean Croise  

Nka bu kwa àmà Jọn, mb͕e ndi-Ju siri na Jerusalem zigara ya ndi-nchu-àjà na ndi Livai ka ha jua ya, si, Gì onwe-gi bu onye?


Nkewa putara ọzọ n'etiti ndi-Ju n'ihi okwu ndia.


Nikọdimọs we si ya, Èsi aṅa pu imu madu mb͕e ọ kara nká? ọ̀ puru ibà n'afọ nne-ya nke ub͕ò abua, ewe mua ya?


Nikọdimọs zara, si Ya, Ìhe ndia si aṅa pu ime?


Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, I nweghi ihe isere miri, ma olùlù-miri a di omimi: òle ebe kwa ka I nwere miri ahu di ndu?


Ya mere ndi-Ju nātamu ntamu megide Ya, n'ihi na Ọ siri, Mu onwem bu nri nke siri n'elu-igwe ridata.


Ya mere ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e ha nuru okwu ahu, ha siri, Okwu a di ike; ònye puru inu ya?


Ya mere ufọdu n'etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n'ebe Chineke nọ, n'ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n'etiti ha.


Ma mb͕e ha nuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, ufọdu were ya me ihe-ọchì; ma ndi ọzọ siri, Ayi gānu kwa olu-gi bayere nka ọzọ.


Ma madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adighi-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n'ihi na ha bu ihe-nzuzu n'anya-ya; ọ pughi kwa imara ha, n'ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan