O we si ha, Unu onwe-unu bu ndi nāgu onwe-unu na ndi ezi omume n'anya madu; ma Chineke mara obi-unu: n'ihi na ihe di elu n'etiti madu bu ihe-árú n'anya Chineke.
Ọ si ya nke ub͕ò atọ, Saimon, nwa Jọn, àbum eyì-gi? O wutara Pita na Ọ siri ya nke ub͕ò atọ, Àbum eyì-gi? O we si Ya, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara ihe nile; Gi onwe-gi mara na I bu eyìm. Jisus si ya, Nēnye aturum nri.
Jisus siri ha, Ọ buru na Chineke bu Nna-unu, unu gāhum n'anya: n'ihi na Mu onwem siri n'ebe Chineke nọ puta we bia; n'ihi na abiaghm n'Onwem, kama Ya onwe-ya ziterem.
Ma onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, o we mechigide ya obi ebere ya, ìhunanya Chineke si aǹa digide nime ya?
Ọ buru na onye ọ bula gāsi, Anamahu Chineke n'anya, ma ọ nākpọ nwa-nne-ya asì, ọ bu onye-ugha: n'ihi na onye nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya, bú onye ọ huworo, ọ pughi ihu Chineke n'anya, bú Onye ọ nāhughi mb͕e ọ bula.
M'gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M'gēnye kwa unu n'otù n'otù dika ọlu nile unu si di.