41 Anaraghi m otuto n'aka madu.
41 “Anaghị m anabata otuto nke ụmụ mmadụ.
n'ihi na ha huru otuto madu n'anya kari otuto Chineke.
Ma àmà nke Mu onwem nānara esighi n'ọnu madu puta: otú ọ di, ihe ndia ka M'nēkwu, ka ewe zọputa unu.
unu achọghi kwa ibiakutem, ka unu we nwe ndu.
Ma amaram unu, na unu enweghi ihu-n'anya Chineke nime onwe-unu.
Ùnu onwe-unu si aṅa pu ikwe, ebe unu nānara otuto n'aka ibe-unu, ma otuto nke si n'aka Onye ahu Nke nání Ya bu Chineke bia unu achọghi?
Ya mere mb͕e Jisus huru na ha gaje ibia idọkpuru Ya n'ike, ka ha we me Ya eze, O wezugara Onwe-ya ọzọ n'ugwu nání Ya onwe-ya.
Onye nēkwu site n'onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahu bu onye ezi-okwu, ajọ omume adighi kwa nime ya.
Ma Mu onwem achọghi otuto nkem: otù Onye di Nke nāchọ nēkpe kwa ikpé.
Jisus zara, si, Ọ buru na Mu onwem enye Onwem otuto, otuto nkem bu ihe-efu: Nnam bu Onye nēnyem otuto; Onye unu onwe-unu nāsi, na Ọ bu Chineke-unu;
ma-ọbu n'ichọ otuto site na madu, ma-ọbu n'aka-unu, ma-ọbu n'aka ndi ọzọ, mb͕e ayi puru idi ka ibu arọ́, dika ndi-ozi Kraist.
N'ihi na akpọrọ unu ime nka: n'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n'ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile:
N'ihi na Ọ natara nsọpuru na ebube n'aka Chineke, bú Nna, mb͕e Ebube ahu nke kwesiri idi-uku mere ka olu di otú a dara Ya, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di Mu onwem ezi nma: