Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 5:36 - Bible Nso

36 Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 “Ma e nwere m ama dị ukwuu karịa nke Jọn, nʼihi na ọrụ ahụ ya bụ Nna nyere m ka m rụchapụ, bụkwa nke m na-arụ, na-agbara m ama na ọ bụ Nna ahụ zitere m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 5:36
17 Iomraidhean Croise  

Jisus we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu nānu na nke unu nāhu:


O we si ha, Gini mere unu nāchọm? ùnu amataghi na aghaghm idi n'ihe nke Nnam?


Jisus zara ha, si, Agwaram unu, ma unu adighi-ekwe: ọlu nke Mu onwem nālu n'aha Nnam, ndia nāb͕aram àmà.


Ma ufọdu nime ha siri, Onye a, Nke meghere anya onye ahu kpuru ìsì, Ọ̀ pughi ime kwa ka nwoke a ghara inwu anwu?


Ọ buru na alughm ọlu n'etiti ha nke onye ọzọ nālughi, ha agaghi-enwewori nmhie: ma ub͕u a ha ahuwo kpọ kwa Mu na Nnam asì.


Mu onwem nyere Gi otuto n'elu uwa, ebe M'luzuru ọlu I nyeworom ka M'lua.


Ma mb͕e Ọ nọ na Jerusalem n'ememe ngabiga, n'ememe ahu, ọtutu madu kwere n'aha-Ya, n'ihi na ha nāhu ihe-iriba-ama-Ya nile nke Ọ nēme.


N'ihi na Chineke eziteghi Ọkpara-Ya n'uwa ka O kpe uwa ikpé; kama ka ewe site n'aka-Ya zọputa uwa.


Onye ahu biakutere Ya n'abali, si Ya, Rabai, ayi matara na I bu onye-ozizí Nke siworo n'ebe Chineke nọ bia: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru ime ihe-iriba-ama ndia nke Gi onwe-gi nēme, ma ọ buru na Chineke anọyeghi ya.


Jisus si ha, Ihe-oririm bu ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'luzu kwa ọlu-Ya.


Ọ bu onye ọzọ nab͕aram àmà; amata-kwa-ram na àmà nke Ọ nāb͕aram bu ezie.


Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara:


Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n'ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan