Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 5:25 - Bible Nso

25 N'ezie, n'ezie, asim unu, Oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nwuru anwu gānu olu Ọkpara Chineke; ndi nuru gādi kwa ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 5:25
19 Iomraidhean Croise  

n'ihi na nwam nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fururi efu, ewe hu ya. Ha we malite ime ka obi tọ ha utọ.


Ma ayi aghaghi ime ka obi tọ ayi utọ na iṅuri ọṅu: n'ihi na nwa-nne-gi nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fukwara efu, ewe hu ya.


Ma Ọ siri ya, Rapu ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu; ma gi onwe-gi je zisa ozi ala-eze Chineke.


Ma mb͕e ememe ngabiga akērughi, ebe Jisus matara na oge hour Ya abiawo ka O si n'uwa nka lakuru Nna-Ya, ebe Ọ huru ndi nke aka Ya nọ n'uwa n'anya, Ọ huru ha n'anya rue ogwugwu ihe nile.


Okwu ndia ka Jisus kwuru: O we welie anya-Ya le elu-igwe, si, Nnam oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi Otuto:


Jisus si ya, Nwanyi, kwerem, oge hour nābia, mb͕e unu nāgaghi-akpọ isi ala nye Nnam, ma ọ bu n'ugwu a, ma-ọbu na Jerusalem.


Ma oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nākpọ isi ala n'ezie gākpọ isi ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu: n'ihi na ndi di otú ahu ka Nnam nāchọ kwa ka ha buru ndi nākpọ isi ala nye Ya.


N'ihi na dika Nnam nēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, dika Ọ nēme kwa ka ha di ndu, otú a ka Ọkpara-Ya nēme kwa ka ndi Ọ nāchọ di ndu.


Ka ihe a ghara iju unu anya: n'ihi na oge hour nābia mb͕e ndi nile di n'ílì gānu olu-Ya,


Ya mere ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e ha nuru okwu ahu, ha siri, Okwu a di ike; ònye puru inu ya?


N'ìhi gini ka unu nāmaghi ihe M'nēkwu? Ọ bu n'ihi na unu apughi inu okwum.


Onye sitere na Chineke nānu okwu Chineke: n'ihi nka ka unu onwe-unu nānughi ha, n'ihi na unu esiteghi na Chineke.


Ọ zara ha, si, Agwaram unu ọbuná ub͕u a, ma unu anugh: gini mere unu nāchọ inu ya ọzọ? ùnu onwe-unu nāchọ kwa ighọ ndi nēso uzọ-Ya?


Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na Ya ibà n'ọnwu ahu: ka, dika esitere n'ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a.


Unu onwe-unu ka O me-kwa-ra ka unu di ndu, mb͕e, unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na nmehie nile unu,


ọbuná mb͕e ayi nọ n'ọnwu site na ndahie nile ayi, O mere ka ayi so Kraist dikọ ndu (ejiwo amara zọputa unu),


N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.


Unu onwe-unu kwa, mb͕e unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na ebìghi-úgwù nke anu-aru-unu, ọbuná unu ka O mere ka unu so Ya dikọ ndu, mb͕e O weresiri amara b͕aghara ayi ndahie-ayi nile;


Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Sadis akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nwere Mọ asa ahu nke Chineke, na kpakpando asa ahu: Amataram, ọlu-gi nile, na i nwere aha na i di ndu, ma i bu onye nwuru anwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan