Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 5:23 - Bible Nso

23 ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 5:23
47 Iomraidhean Croise  

Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n'iyì n'uzo, N'ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.


Mu onwem bu Jehova; nke ahu bu aham: M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum, M'gaghi-enye kwa arusi di iche iche apiri api otutom.


Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.


N'ezie Gi onwe-gi bu Chineke Nke nēzobe Onwe-gi, Gi Chineke Israel, bú Onye-nzọputa.


Gosinu, weta-kwa-nu ha nso; e, ka ha b͕akọ ìzù n'otù: ònye mere ka anu ihe a site na mb͕e gara aga? onye sitere na mb͕e ochie gosi ya? ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? ọ dighi kwa Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem; Chineke Nke nēme ezi omume na onye-nzọputa adighi ma ewezuga nání Mu onwem.


Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.


Onye nāhu nna-ya ma-ọbu nne-ya n'anya kari Mu adighi-ekwesim; onye nāhu kwa nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwanyi n'anya kari Mu adighi-ekwesim.


Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.


Ọ bu kwa n'aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi.


Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha; Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.


Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ:


Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem.


Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu.


Onye ahu gēto Mu onwem: n'ihi na Ọ gēwere n'ihe nkem, kọ-kwa-ra unu ya.


ihe nile nke bu nkem bu kwa nke Gi, nke Gi bu kwa nkem: enyewokwam otuto nime ha.


Pọl nka nēdegara ndi nile nọ na Rom akwukwọ, bú ndi Chineke huru n'anya, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke Nna-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist bia.


Ọzọ kwa, Aisaia si, Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi, Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile; Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya.


Ma ub͕u a ebe unu pusiri na nmehie nwere onwe-unu, ghọ kwa ndi-orù nke Chineke, unu nwere nkpuru-unu nēweta ido-nsọ, unu nwe-kwa-ra ndu ebighi-ebi dika ọgwugwu-ya.


Ma unu onwe-unu anọghi n'anu-aru, kama unu nọ nime Mọ Nsọ, ma ọ buru na ọbu ezie na Mọ nke Chineke nēbi nime unu. Ma ọ buru na onye ọ bula enweghi Mọ nke Kraist, onye ahu abughi nke Ya.


Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.


Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.


Ọ buru na onye ọ bula adighi-ahu Onye-nwe-ayi n'anya, ka ọ buru anathema. Onye-nwe-ayi nābia.


Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;


e, ayi onwe-ayi enwewo ọziza azara nime onwe-ayi na ọ bu ọnwu, ka ayi we ghara itukwasi obi n'onwe-ayi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie:


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile.


N'ihi na ihu-n'anya Kraist nērugide ayi; ebe ayi nātule nka, na otù Onye nwuru n'ọnọdu madu nile, ya mere madu nile nwuru;


nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n'otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n'otù ahu.


Ka amara diyere ndi nile huru Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'anya n'emebighi-emebi.


Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.


Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.


Saimon Pita, orù na onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi ketaworo okwukwe di oké ọnu-ahia ra ka nke ayi ketaworo n'ezi omume Onye ahu, bú Chineke-ayi na Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;


Ma nābanu uba n'amara na ọmuma nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist. Ọ bu Ya ka otuto diri ma ub͕u a ma rue ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi. Amen.


Onye ọ bula nke nāgọnari Ọkpara ahu, o nweghi kwa Nna ahu: onye nēkwuputa Ọkpara ahu, o nwe-kwa-ra Nna ahu.


Onye ọ bula nke nāga n'iru, nke nādighi-anọgide kwa nime ozizí nke Kraist-ayi, o nweghi Chineke: onye nānọgide nime ozizí ahu, onye ahu nwere Nna ahu, Ya na Ọkpara-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan