Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 5:17 - Bible Nso

17 Ma Jisus zara ha, si, Nnam nālu ọlu rue ub͕u a, Mu onwem nālu kwa ọlu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Jisọs sịrị ha, “Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 5:17
15 Iomraidhean Croise  

Onye nēji ike-Ya me ka ugwu nile guzosie ike; Ebe ewerewo idi-ike ke Ya n'úkwù:


Welienu anya-unu elu, hu: ọ̀ bu Onye kère ihe ndia? ọ bu Onye ahu Nke nēme ka usu-ha puta n'ọnu-ọgugu: ha nile n'aha-ha ka Ọ nākpọ; site n'iba-uba nke ike-Ya, na n'ihi na O nwere ume n'ike, ọ dighi ihe fọduru nke anāgughi.


Àdighi-ere egwele abua n'otù penny? ma otù nime ha agaghi-adà n'ala ma Nna-unu ekwegh:


ùnu onwe-unu nēkwu okwu bayere Onye ahu Nnam doro nsọ zite kwa n'uwa, si, I nēkwulu Chineke; n'ihi na asim, Abum Ọkpara Chineke?


Ì kweghi na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem? okwu Mu onwem nāgwa unu ekwughi m n'Onwem: ma Nnam Nke nēbi nimem nālu ọlu-Ya.


N'ihi nka ka ndi-Ju nēsob͕u kwa Jisus, n'ihi na Ọ nēme ihe ndia n'ubọchi-izu-ike.


Ya mere n'ihi nka ka ndi-Ju nāchọ kari uzọ ib͕u Ya, n'ihi na ọ bughi nání na Ọ nēmebi ubọchi-izu-ike, kama Ọ nākpọ kwa Chineke Nna nke aka Ya, nēme ka Ya onwe-ya na Chineke ra.


Ayi aghaghi ilu ọlu Onye ziterem, mb͕e ubọchi fọduru: abali nābia, mb͕e ọ dighi onye ọ bula puru ilu ọlu.


Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù.


n'ihi na ọ bu nime Ya onwe-ya ka ayi nādi ndu, nējeghari kwa, nādi kwa; dika ufọdu ọbuná nime ndi nke unu ndi nēme abù kwuworo, si, N'ihi na ayi bu kwa ndi Ọ muru.


Òkìkè ihe alutaworo n'ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile.


n'ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n'elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n'aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile;


Ọ bu kwa n'ihi nka ka ayi onwe-ayi nēkele kwa Chineke nēwepughi aka, na, mb͕e unu natara okwu nke unu nuru n'ọnu-ayi, bú okwu nke Chineke, ọ bughi okwu madu ka unu nara nke-ọma, kama, otú ọ di n'ezi-okwu, ọ bu okwu Chineke, nke nālusi kwa ọlu ike nime unu ndi kwere ekwe.


Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan