Ma ọ puru, malite ikwusazu ya, na ifesa okwu ahu, nke mere na O nweghi ike ọzọ ibà nime obodo n'iru ọra, kama Ọ nọ n'azu obodo n'ebe bu ọhia: ha we si n'ebe nile nābiakute Ya.
Ya mere n'ihi nka ka ndi-Ju nāchọ kari uzọ ib͕u Ya, n'ihi na ọ bughi nání na Ọ nēmebi ubọchi-izu-ike, kama Ọ nākpọ kwa Chineke Nna nke aka Ya, nēme ka Ya onwe-ya na Chineke ra.