Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 4:42 - Bible Nso

42 ha we si nwanyi ahu, Ọ bughi n'ihi ihe i kwuru ka ayi nēkwe ub͕u a: n'ihi na ayi onwe-ayi anuwo, mata kwa na Onye a bu Onye-nzọputa nke uwa n'ezie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

42 Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 4:42
23 Iomraidhean Croise  

Chenum iru, ewe zọputa unu, unu nsọtu nile nke uwa: n'ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di.


Jehova ab͕abawo ogwe-aka-Ya di nsọ ọtọ n'anya mba nile; nsọtu nile nke uwa we hu nzọputa nke Chineke-ayi.


Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n'ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha.


Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ, Na ebube ndi-Gi, bú Israel.


N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!


Ya mere mb͕e Jisus biara, Ọ huru na ọ diwori n'ílì ubọchi anọ a.


n'ihi na okwu I nyerem ka M'nyeworo ha; ha onwe-ha we nara ha, mara kwa n'ezie na esim n'ebe I nọ puta, ha kwere kwa na Gi onwe-gi ziterem.


Bianu, le otù Nwoke, Onye gwaram ihe nile m'mere: Ònye a gābu Kraist ahu?


Ma ndi kwere n'ihi okwu-Ya kariri ri nne;


Site na nkpuru nwoke a ka Chineke wetara Israel Onye-nzọputa, bú Jisus, dika nkwa-Ya si di;


Nzọputa adighi kwa n'onye ọ bula ọzọ: n'ihi na aha ọzọ di iche adighi kwa n'okpuru elu-igwe, nke enyeworo n'etiti madu, nke anāghaghi izọputa ayi nime ya.


Onye ahu ka Chineke were aka-nri-Ya welie elu ibu Onye-ndú na Onye-nzọputa, inye Israel nchèghari na nb͕aghara nmehie.


nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n'otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n'otù ahu.


N'ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n'ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe.


Ya onwe-ya bu kwa ihe ijuru Chineke obi bayere nmehie nile ayi; ma Ọ bughi ihe ijuru Ya obi bayere nání nmehie nke ayi onwe-ayi, kama Ọ bu kwa ihe ijuru Ya obi bayere nmehie nke uwa dum;


Ayi onwe-ayi ahuwo kwa, ayi nāb͕a kwa àmà, na Nna-ayi ezitewo Ọkpara-Ya ka Ọ buru Onye-nzọputa nke uwa.


Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan