Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, Rue mb͕e Shailo gābia; Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.
Ya mere, mb͕e nzukọ Kraist dupusiri ha n'ije-ha, ha gabigara n'etiti Finisia, gabiga kwa n'etiti Sameria, nākọ nchighari nke ndi mba ọzọ: ha nēme kwa ka oké ọṅù diri umu-nna nime Kraist nile.
Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.