Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 3:14 - Bible Nso

14 Ma dika Moses weliri agwọ n'ọhia, ọbuná otú a aghaghi iweli Nwa nke madu elu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 3:14
16 Iomraidhean Croise  

Ya onwe-ya wezugara ebe nile di elu, titue ogidi nile, b͕utue Ashera: o tipia-kwa-ra agwọ ọla nke Moses mere; n'ihi na rue mb͕e ahu umu Israel nēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpọ ya Nehushtan.


N'ihi na nkita dim buruburu: Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu; Ha nādupú akam abua na ukwum abua.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na nkpọrọgwu Jesi, nke nēguzo ibu ọkọlọtọ ndi nile di iche iche, ya ka mba nile gāju ase; ebe-izu-ike-ya gābu kwa ebube.


Ihe edeworo n'akwukwọ nsọ gēsi kwa aṅa mezu, na ọ ghaghi ime otú a?


Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.


ya na otú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi-ayi rara Ya nye ka ama Ya ikpé ọnwu, we kpọgide Ya n'obe.


ka okwu Jisus we mezu, nke O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gajē inwu.


Mu onwem bu nri di ndu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n'ihi ndu nke uwa.


Ya mere Jisus siri, Mb͕e ọ bula unu gēweliwori Nwa nke madu elu, mb͕e ahu ka unu gāmara na Mu onwem bu Ya, na ọ dighi kwa ihe M'nēme n'Onwem, kama dika Nnam zírim, otú a ka m'nēkwu ihe ndia.


Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan