nye kwa Solomon nwam obi zuru okè, idebe ihe nile I nyere n'iwu, na ihe-àmà-Gi nile, na ukpuru-Gi nile, na ime ihe ndia nile, na iwu ulo uku ahu, nkem'doziworo ihe bayere ya.
N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gētiye iwum n'ime-ha, ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ya dika n'akwukwọ; M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:
N'oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu:
O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ya onwe-ya nēzi ihe; ndi-Farisi na ndi-ozizí iwu Moses nānọ kwa Ya nso, ndi siri n'obodo ntà nile nke Galili na Judia na Jerusalem puta: ike nke Onye-nwe-ayi diye-kwa-ra Ya ime ka aru di madu ike.
Ma otù onye biliri na nnọkọ-ikpé ahu, bú onye-Farisi, aha-ya bu Gameliel, onye nēzí iwu Moses, onye ndi-Ju nile nāsọpuru, o we kwue ka akpọpu madu ahu n'èzí nwa oge.
Jehova, bú Chineke-gi, gēbì kwa n'obi-gi, na obi nkpuru-gi, úgwù, iwere obi-gi nile, na iwere nkpuru-obi-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, ka i we di ndu.
n'ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n'anu-aru-ayi: