Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 20:2 - Bible Nso

2 Ya mere ọ b͕a ọsọ, biakute Saimon Pita, biakute kwa onye ọzọ ahu nēso uzọ Jisus, onye Jisus huru n'anya, si ha, Ha ebupuwo Onye-nwe-ayi n'ílì, ayi amataghi kwa ebe ha tọb͕orọ Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 20:2
9 Iomraidhean Croise  

Otù onye n'etiti ndi nēso uzọ-Ya nānọdu na nri nādabere n'obi Jisus, onye Jisus huru n'anya.


Ya mere mb͕e Jisus huru nne-Ya, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Ọ huru n'anya, ka o nēguzo nso, Ọ si nne-Ya, Nwanyi, le, nwa-gi nwoke!


Ndi ahu we si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? Ọ si ha, N'ihi na ha bupuru Onye-nwem, amatakwaghm ebe ha tọb͕ọrọ Ya.


Jisus si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? ònye ka i nāchọ? Nwanyi ahu, ebe ọ nēchè na Ọ bu onye-nche ubi ahu ab͕ara ogige, ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na Gi onwe-gi bupuru Ya, gwam ebe I tọb͕ọrọ Ya, mu onwem gēbupu kwa ya.


N'ihi na ha akāmataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, na Ọ ghaghi isi na ndi nwuru anwu bilie.


Pita we chigharia, hu onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Jisus huru n'anya, ka o nēso; onye nādabere kwa n'obi-Ya na nri-anyasi ahu, si, Onye-nwe-ayi, ònye bu onye ahu nke nārara Gi nye?


Nka bu onye ahu nēso uzọ Jisus nke nāb͕ara ihe ndia àmà, nke de-kwa-ra ihe ndia n'akwukwọ: ayi mata-kwa-ra na àmà-ya bu ezie.


Ya mere onye ahu nke nēso uzọ-Ya onye Jisus huru n'anya siri Pita, Ọ bu Onye-nwe-ayi. Ya mere mb͕e Saimon Pita nuru na ọ bu Onye-nwe-ayi, o b͕okwasi uwe uku ya (n'ihi na ọ b͕ara ọtọ), we tubà onwe-ya nime oké osimiri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan