10 Ya mere ndi ahu ndi nēso uzọ Jisus laghachiri ọzọ n'ulo nke aka ha.
10 Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha.
Ma Pita biliri, b͕a ọsọ jerue ílì; o we ruru ala, nyo nime ya, we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ nání ha; o we la n'ulo-ya, ihe nke meworo nēju kwa ya anya.
Le, oge hour nābia, ọ biawo kwa, ka unu gāb͕asa, onye ọ bula ọ la na nke ya, unu gārapu kwa nání Mu: otú ọ di, nání Mu anọghi, n'ihi na Mu na Nnam nọ.
Ma Meri nēguzo n'èzí na nso ílì ahu nākwa ákwá: ya mere, ka ọ nākwa, o ruru ala nyo nime ílì;
Ha nile we la, onye ọ bula n'ulo nke aka ya: