Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 19:34 - Bible Nso

34 otú ọ di, otù onye n'etiti ndi-agha were ube ma Ya n'akuku, ngwa ngwa ọbara na miri we puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 19:34
23 Iomraidhean Croise  

I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.


M'gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M'gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.


M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.


N'ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú.


Ma n'echi-ya, nke bu ubọchi so ubọchi Nkwadebe, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi zukọrọ jekuru Pailat,


ma mb͕e ha biaruru Jisus, hu kwa na Ọ nwuwori ub͕u a, ha etijighi ogwe-ukwu-Ya:


Mb͕e O kwusiri nka, O gosi ha aka-Ya abua na akuku-Ya. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya ṅuriri ọṅu, mb͕e ha huru Onye-nwe-ayi.


Ub͕u a kwa gini mere i nāla azu? bilie, ka eme gi baptism, sachapu kwa nmehie-gi nile, nākpọku aha-Ya.


Ma unu onwe-unu sitere na Ya di nime Kraist Jisus, Onye ghọrọ amam-ihe nye ayi site na Chineke, bú ezi omume, na ido-nsọ kwa, na nb͕aputa:


Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.


ka O we do ya nsọ, mb͕e O mesiri ka ọ di ọcha site n'ọsisa miri n'okwu Chineke,


Onye nyere Onwe-ya n'ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n'imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku.


N'ihi na asi na ọbara nke ewu na nke oke-ehi, na ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi, mb͕e ọ nēfesa ndi emeruworo emeru, nēdo madu nsọ ime ka anu-aru-ha di ọcha:


Ọ fọduru ihe ntà ka m'si na eji kwa ọbara eme ihe nile ka ha di ọcha, dika iwu-ayi si di, ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi.


bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist;


Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu.


N'ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu.


nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;


M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan