Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 18:1 - Bible Nso

1 Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, Ọ pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, gabiga n'ofè iyi Kidron, ebe ubi ab͕ara ogige di, nke Ọ bàra nime ya, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya rịdara ndagwurugwu iyi Kidrọn rigorokwa nʼofe nke ọzọ, ebe e nwere otu ogige, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 18:1
25 Iomraidhean Croise  

Jehova, bú Chineke, we were madu ahu me ka ọ nọdu n'ubi Iden ab͕ara ogige ilu ọlu-ya na idebe ya.


Jehova, bú Chineke, we zipu ya n'ubi Iden ab͕ara ogige, ilu ọlu ala ahu nke esiri na ya weputa ya.


Ala ahu nile nākwa ákwá n'oké olu, ndi ahu nile nāgabiga kwa: eze nāgabiga kwa miri-iyi Kidron, ndi-ya nile nāgabiga kwa, n'iru uzọ ọzara.


Ọzọ kwa, Meaka, bú nne-ya, o wezuga-kwa-ra ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, o sure ya ọku na miri-iyi Kidron.


O gēru kwa, n'ubọchi i gāpu, gabiga miri-iyi Kidron, na i gāmara nke-ọma na i ghaghi inwu: ọbara-gi gādi n'isi-gi.


Ebe-ichu-àjà nile nke di n'elu ime-ulo-elu nke Ehaz, nke ndi-eze Juda mere, na ebe-ichu-àjà nile nke Manase mere n'ogige abua nke ulo Jehova, eze kwaturu ha, we si n'ebe ahu b͕a ọsọ, kpofue uzuzu-ha nime miri-iyi Kidron.


Eze we nye Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nke usoro nke-abua, na ndi nēche nbata-uzọ, iwu, isi n'ulo Jehova weputa ihe nile nke emeworo nye Beal, nye kwa Ashera, nye kwa usu nile nke ihe elu-igwe: o we sure ha ọku n'azu Jerusalem n'ọhia Kidron, būru ntu-ha je Bet-el.


O si-kwa-ra n'ulo Jehova buputa Ashera je n'azu Jerusalem, rue miri-iyi Kidron, sure ya ọku n'akuku miri-iyi Kidron, supia ya me ka ọ di ka uzuzu, kpofue uzuzu-ya n'elu ílì ndi efu.


Ọzọ kwa, Meaka nne Esa, bú eze, o wezugara ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, ọ supia ya, sure ya ọku na miri-iyi Kidron.


Ndi-nchu-àjà we ba n'ime-ime nke ulo Jehova, ime ka o di ọcha, ha we buputa ihe ruru árú nile nke ha chọtara n'ulo uku Jehova tiye ya n'ogige ulo Jehova. Ndi Livai we nara ya, ibupu ya je miri-iyi Kidron n'èzí.


Ha we bilie wezuga ebe-ichu-àjà nile nke di na Jerusalem, ha wezuga-kwa-ra ebe nile nke isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha we kpofue ha nime miri-iyi Kidron.


M'we nārigo na miri-iyi n'abali, m'we nēle mb͕idi ahu anya; m'we chigharia, ba n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, we laghachi.


Ndagwurugwu ahu nile nke ozu, na nke ntu, na ọzara nile rue miri-iyi Kidron, rue nkuku ọnu-uzọ-ama inyinya n'akuku ọwuwa-anyanwu, gābu ihe nsọ Jehova nwere; agaghi-eropu ya, agaghi-etikpọ kwa ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Nyawa ya na nnyawa-ya nile, wukwasi ya manu: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu.


Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.


Mb͕e ahu Jisus na ha biarue ogige anākpọ Getsemane, Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'gēje n'ebe ahu kpe ekpere.


Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.


Ha we biarue ogige nke aha-ya bu Getsemane: O we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'nēkpe ekpere.


Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso.


ma ka uwa we mara na anamahu Nnam n'anya, ka ọ mara kwa na dika Nnam nyerem iwu, otú ahu ka M'nēme. Bilienu, ka ayi si n'ebe a pua.


Otù onye nime ndi-orù onye-isi-nchu-àjà, buri onye-ikwu nke onye ahu Pita bipuru nti-ya, si, Mù onwem ahughi gi na Ya n'ubi ahu ab͕ara ogige?


O we biakute ayi, chiri ihe-ọkiké Pọl, ke onwe-ya ukwú na aka, si, Okwu ndia ka Mọ Nsọ kwuru, si, Otú a ka ndi-Ju ndi nọ na Jerusalem gēke nwoke nwe ihe-ọkiké a, ha gārara kwa ya nye n'aka ndi mba ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan