Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 17:12 - Bible Nso

12 Mb͕e Mu na ha nọri, Mu onwem nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom: eche-kwa-ram ha, ọ dighi kwa onye ọ bula nime ha lara n'iyì, ma-ọbughi nwa nke ila-n'iyì ahu; ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 17:12
17 Iomraidhean Croise  

Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim, Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem.


Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M'rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem.


Emerem ka aha-Gi puta ìhè nye ndi I nyerem site 'uwa: Gi onwe-gi nwere ha, I were kwa ha nyem; ha edebewo kwa okwu-Gi.


ka okwu O kwuru we mezu, si, N'etiti ndi I nyeworom ọ dighi onye ọ bula M'tufuru.


Ihe nile nke Nnam nēnyem gābiakutem; onye nābiakutekwam M'gaghi-achupu ya ma-ọli.


inara ọnọdu n'ije-ozi na ọlu onye-ozi a, nke Judas jehiere nime ya, ka o we ga n'ebe nke aka ya.


N'ihi nka Chineke welikwara Ya elu nke-uku, were kwa amara nye Ya aha ahu nke kariri aha nile ọ bula elu;


unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n'uzọ ọ bula: n'ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n'iyì,


Ọzọ kwa, Mu onwem ganātukwasi obim na Ya. Ọzọ kwa, Le, Mu onwem na umu-ntakiri Chineke nyerem.


Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.


Anya-Ya abua buru kwa ire ọku, Ọ nēkpu kwa ọtutu okpu-eze n'isi-Ya; O nwe-kwa-ra aha edeworo, nke ọ nādighi onye ọ bula matara, ma-ọbughi Ya onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan