Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 16:14 - Bible Nso

14 Onye ahu gēto Mu onwem: n'ihi na Ọ gēwere n'ihe nkem, kọ-kwa-ra unu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ọ ga-enye m otuto, nʼihi na ọ ga-esite nʼaka m nata ihe ọ ga-akọrọ unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 16:14
20 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e ọ bula Onye-nkasi-obi ahu gābia, Onye Mu onwem gēsi n'ebe Nnam nọ zitere unu, bú Mọ nke ezi-okwu, Onye si na Nnam puta, Onye ahu gāb͕aram àmà:


M'we da n'ala n'iru ukwu-ya ikpọ isi ala nye ya. O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi nke nwere àmà nke Jisus: kpọ isi ala nye Chineke: n'ihi na àmà nke Jisus bu mọ nke amuma.


N'ihi na ayi onwe-ayi ji Mọ Nsọ nēchesi ihe anēle anya ike, bú ezi omume, site n'okwukwe.


N'ihi na ọ bu Chineke, Onye siri, Ìhè gēsi nime ọchichiri nwuputa, bu Onye nwubàra nime obi-ayi, iweta inye-ìhè nke ọmuma nke ebube nke Chineke n'iru nke Jisus Kraist.


N'ihi nka emem ka unu mara na ọ dighi onye ọ bula nke nēkwu okwu nime Mọ nke Chineke nāsi, Jisus bu anathema; ọ dighi kwa onye ọ bula puru isi, Jisus bu Onye-nwe-ayi, ma-ọbughi nime Mọ Nsọ.


Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi.


Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu.


Nka bu kwa ihe O nyere n'iwu, ka ayi kwere n'aha nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist, hurita kwa onwe-ayi n'anya, dika O nyere ayi iwu.


Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n'ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n'ihi na akēnyeghi Jisus otuto.


Ya mere ọ bu unu, bú ndi kwere ekwe, ka nsọpuru ahu diri: ma n'ebe ndi nādighi-ekwe nọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo;


M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.


Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan