Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 15:7 - Bible Nso

7 Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe o bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 15:7
24 Iomraidhean Croise  

Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M'gēnye gi.


N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ, I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.


Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya; Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.


N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi.


Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.


Ihe onye nēmebi iwu nātu ujọ ya, nke ahu gābiakute ya: Ma ihe ndi ezi omume nāchọsi ike ka agēnye ha.


O we zím ihe, sim, Ka obi-gi jide okwum nile; Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu:


Mb͕e ahu ka ìhè-gi gāwaputa dika ututu, anu-aru ọhu gēpuchi kwa n'aru-gi ngwa ngwa: ezi omume-gi gāga kwa n'iru gi: nsọpuru Jehova gāga n'azu gi.


Achọputawo okwu-Gi, m'we rie ha; okwu-Gi we ghọrọm ihe-obi-utọ na ọṅù obim: n'ihi na akpọkwasiwom aha-Gi, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha.


Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu:


Ihe ọ bula unu gāriọ kwa n'aham, ihe ahu ka M'gēme, ka ewe nye Nnam otuto nime Ọkpara-Ya.


Ọ bughi unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n'aham, ka O we nye unu ya.


N'ubọchi ahu ọ dighi ihe ọ bula unu gājum. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n'aham.


Ya mere Jisus nāsi ndi-Ju ndi kwere-Ya-ri, Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n'okwum, unu bu ndi nēso uzọm n'ezie;


Amataram na unu bu nkpuru Abraham; ma unu nāchọ uzọ ib͕um, n'ihi na okwum enweghi ọnọdu nime unu.


kama ọ nọ n'okpuru ndi etiyere ya n'aka-ha na ndi nāchi èzí-na-ulo-ya rue oge nna-ya buru uzọ ka àka.


Ma asim, Nējegharinu site na Mọ Nsọ, unu agaghi-emezu kwa agu nke anu-aru maọli.


Okwu ndia, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, gādikwasi kwa n'obi-gi:


Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.


Ndi bu nna, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu nke di site na mbu. Umu-okorọbia, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu di ike, okwu Chineke nānọgide kwa nime unu, unu emeriwo kwa ajọ onye ahu.


Unu onwe-unu kwa, otite-manu ahu nke unu natara n'aka-Ya nādigide nime unu, ọ dighi kwa unu nkpà ka onye ọ bula zí unu ihe; kama dika otite-manu-Ya nēzí unu ihe bayere ihe nile, dika ọ bu kwa ezie, nābughi kwa okwu-ugha, dika O zíkwara unu, nānọgidenu nime Ya.


ihe ọ bula ayi nāriọ kwa, ayi nānata ya n'aka-Ya, n'ihi na ayi nēdebe ihe nile Ọ nyere n'iwu, ayi nēme kwa ihe nile nātọ utọ n'iru Ya.


Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n'ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan