Jisus si ya, Onye asaworo aru, nkpà isa aru ọzọ adirighi ya ma-ọbughi isa ukwu-ya, kama aru-ya dum di ọcha: unu onwe-unu di kwa ọcha, ma ọ bughi unu nile.
Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n'iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n'anya, sitenu n'obi-unu hurita onwe-unu n'anya si-ike: