Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 15:10 - Bible Nso

10 Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 15:10
28 Iomraidhean Croise  

N'ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova, Emebighkwam iwu n'ipu n'aka Chinekem.


O we rapara Jehova n'aru, o sighi n'iso Ya wezuga onwe-ya, o we debe ihe nile O nyere n'iwu, bú nke Jehova nyere Moses n'iwu.


Moses na Eron we me ya; dika Jehova nyere ha iwu, otú a ka ha mere.


Onye-nwe-ayi Jehova emegheworom ntim, ma Mu onwem enupugh isi, alaghachighm azu.


Ọ dighi onye ọ bula nānapum ya, kama Mu onwem nātọb͕ọ ya n'Onwem. Enwerem ike itọb͕ọ ya, enwe-kwa-ram ike inara ya ọzọ. Ihe a enyere n'iwu ka M'natara n'aka Nnam.


N'ihi na Mu onwem ekwughi site n'Onwem; kama Nna ziterem, Ya onwe-ya enyewom iwu, ihe M'gēkwu, na otú M'gēkwu ya.


Ọ buru na unu nāhum n'anya, unu gēdebe ihe nile M'nyere n'iwu.


Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya.


Jisus zara, si ya, Ọ buru na madu ahum n'anya, ọ gēdebe okwum: Nnam gāhu kwa ya n'anya, Ayi gābiakute kwa ya, nēme kwa ebe-obibi-Ayi n'ebe ọ nọ.


ma ka uwa we mara na anamahu Nnam n'anya, ka ọ mara kwa na dika Nnam nyerem iwu, otú ahu ka M'nēme. Bilienu, ka ayi si n'ebe a pua.


Mu onwem nyere Gi otuto n'elu uwa, ebe M'luzuru ọlu I nyeworom ka M'lua.


Jisus si ha, Ihe-oririm bu ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'luzu kwa ọlu-Ya.


Mu na Onye ziterem nọ kwa; Ọ rapughi nání Mu; n'ihi na Mu onwem nēme ihe nātọ Ya utọ mb͕e nile.


unu amaghi kwa Ya; ma Mu onwem matara Ya; ọ buru kwa na agamasi, Amataghm Ya, M'gēyi unu, buru onye-ugha: ma amataram Ya, nēdebe kwa okwu-Ya.


Obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe; kama ọ bu idebe ihe nile Chineke nyere n'iwu.


Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n'aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari.


N'ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n'obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n'etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile;


N'ihi na ọ gākawori nma ma ọ buru na ha akāmazughi uzọ ezi omume, kari imazu ya, we si n'ihe di nsọ ahu enyere n'iwu, nke enyere ha n'aka idebe, laghachi.


nime nka ka ayi ma-kwa-ra na ayi amawo Ya, ma ọ buru na ayi edebe ihe nile O nyere n'iwu.


ma onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihunanya Chineke zue okè n'ezie. Nime nka ka ayi mara na ayi nọ nime Ya:


onye nāsi na ọ nānọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri.


N'ihi na nka bu ihu-n'anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n'iwu: ihe O nyere n'iwu adighi kwa arọ́.


Ngọzi nādiri ndi nāsa uwe-nwuda-ha, ka ha we nwe ike n'ebe osisi nke ndu ahu di, si kwa n'ọnu-uzọ-ama ahu ba nime obodo ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan