Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 15:1 - Bible Nso

1 Mu onwem bu ezi osisi vine, Nnam bu kwa onye-ọlu-ubi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 “Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 15:1
28 Iomraidhean Croise  

Ka ayi bilie n'isi-ututu je rue ubi-vine nile; Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru, Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko: N'ebe ahu ka m'gēnye gi ihu-n'anyam.


N'ubọchi ahu ka ihe-opupú nke Jehova gāghọ ihe mara nma na ihe-nsọpuru, nkpuru nke ala gāghọ-kwa-ra ndi Israel b͕apuru ab͕apu nbili-elu na ima-nma.


Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M'ma nma.


idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n'isi n'ọnọdu ntu, manu obi-utọ n'ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n'ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma.


Ọtutu ndi-ọzùzù-aturu ebibiwo ubi-vine nkem, ha azọdawo òkèm, ha emewo òkèm anāchọsi ike ka ọ ghọ ọzara tọb͕ọrọ n'efu.


Ma Mu onwem kuru gi-ri osisi vine kachasi nma, nkpuru nke bu nání ihe ziri ezi: ì si kwa aṅa b͕anwe orù osisi vine nke ala ọzọ n'ebe M'nọ?


Nne-gi di ka osisi vine, n'ọbara-gi, n'akuku miri ka akuworo ya: osisi nke nāmi nkpuru nke juputa-kwa-ra na ngalaba ka ọ bu site n'ọtutu miri.


Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.


Biko, nuru, gi Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, gi onwe-gi na ndi-ibe-gi ndi nānọdu ala n'iru gi; n'ihi na ndi bu ihe-ebube ka ha bu: n'ihi na, le, M'gaje ime ka orùm, bú Ihe-opupú ahu, puta ìhè.


Ma Ọ zara, si, Agēropu ihe-ọkukú ọ bula nke Nnam nke elu-igwe nākughi.


N'ihi na ala-eze elu-igwe yiri nwoke nke bu nna-nwe-ulo, onye puru n'isi-ututu igota ndi-ọlu ije n'ubi-vine-ya.


Nurunu ilu ọzọ: Otù nwoke di, bú nna-nwe-ulo, onye kuru ubi-vine, b͕a ya ogige buruburu, gwu kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nime ya, wu kwa ulo-elu, were kwa ya tiyere n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.


O we malite igwa ha okwu n'ilu. Otù onye kuru ubi-vine, ọ b͕a ya ogige gburugburu, gwu kwa ebe inara manya agāzọchapu na nkpuru-vine, o wu-kwa-ra ulo-elu, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.


O we tua ilu a; Otù onye nwere osisi fig akuru n'ubi-vine-ya; o we bia nāchọ nkpuru n'elu ya, ma ọ hughi.


N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia.


Ezi Ìhè ahu diri, Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè.


Alaka ọ bula nimem nke nādighi-ami nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mia nkpuru kari.


Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ bughi Moses nyere unu nri ahu nke sitere n'elu-igwe; kama ọ bu Nnam nēnye unu ezi nri ahu nke sitere n'elu-igwe.


N'ihi na anu-arum bu ihe-oriri n'ezie, ọbaram bu kwa ihe-ọṅuṅu n'ezie.


Ma ọ buru na anyakapuru alaka ufọdu, ma gi onwe-gi, ọ bu ezie na i bu osisi olive nke ọhia, ma anyakudoro gi n'etiti ha, i ghọ-kwa-ra onye gi na ha nēnwekọ nkpọrọgwu nke umi nke olive ahu;


N'ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu.


Ọzọ, ihe ọhu enyere n'iwu ka m'nēdegara unu, ya bu ihe nke bu ezi-okwu nime Ya na nime unu; n'ihi na ọchichiri ahu nāgabiga, ezi ìhè ahu nāmu kwa ub͕u a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan