Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 14:10 - Bible Nso

10 Ì kweghi na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem? okwu Mu onwem nāgwa unu ekwughi m n'Onwem: ma Nnam Nke nēbi nimem nālu ọlu-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 14:10
26 Iomraidhean Croise  

Ma ọ buru na aluam ha, ọbuná ma asi na unu ekweghi Mu onwem, nēkwerenu ọlum: ka unu we mara nāmagide kwa na Nnam di nimem, na Mu onwem di kwa nime Nnam.


ọzọ, onye ọ bula nke nādi ndu, nke nēkwere kwa na Mu, ọ gaghi-anwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. I kwere nka?


N'ihi na Mu onwem ekwughi site n'Onwem; kama Nna ziterem, Ya onwe-ya enyewom iwu, ihe M'gēkwu, na otú M'gēkwu ya.


Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bughi, kwerenum n'ihi ọlum onwe-ha.


N'ubọchi ahu unu onwe-unu gāmara na Mu onwem nọ nime Nnam, na unu onwe-unu nọ kwa nimem, na Mu onwem nọ kwa nime unu.


Onye nādighi-ahum n'anya adighi-edebe okwum nile: okwu nke unu nānu abughi kwa nkem, kama ọ bu nke Nna Onye ziterem.


n'ihi na okwu I nyerem ka M'nyeworo ha; ha onwe-ha we nara ha, mara kwa n'ezie na esim n'ebe I nọ puta, ha kwere kwa na Gi onwe-gi ziterem.


Onye ahu biakutere Ya n'abali, si Ya, Rabai, ayi matara na I bu onye-ozizí Nke siworo n'ebe Chineke nọ bia: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru ime ihe-iriba-ama ndia nke Gi onwe-gi nēme, ma ọ buru na Chineke anọyeghi ya.


Ma Jisus zara ha, si, Nnam nālu ọlu rue ub͕u a, Mu onwem nālu kwa ọlu.


Ya mere Jisus zara, si ha, N'ezie, n'ezie asim unu, Ọkpara apughi ime ihe ọ bula n'Onwe-ya, ma-ọbughi ihe Ọ huru na Nna-Ya nēme: n'ihi na ihe ọ bula Ya onwe-ya nēme, ndia ka Ọkpara-Ya nēme kwa otú ahu.


Ya mere Jisus zara ha, si, Ozizím abughi nkem, kama ọ bu nke Onye ziterem.


Ya mere Jisus siri, Mb͕e ọ bula unu gēweliwori Nwa nke madu elu, mb͕e ahu ka unu gāmara na Mu onwem bu Ya, na ọ dighi kwa ihe M'nēme n'Onwem, kama dika Nnam zírim, otú a ka m'nēkwu ihe ndia.


Anamekwu ihe Mu onwem huworo n'ebe Nnam nọ: ya mere unu onwe-unu nēme kwa ihe unu nuru n'ọnu nna-unu.


Ma ub͕u a unu nāchọ uzọ ib͕um, bú Madu Nke gwaworo unu ezi-okwu, nke M'nuru n'ọnu Chineke: nka ka Abraham nēmeghi.


bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya.


nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n'otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n'otù ahu.


N'ihi na ọ buri ihe di Nna-Ya ezi nma ka ozuzù nile bigide nìme Ya;


n'ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu,


Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāb͕a àmà, n'ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan