Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 14:1 - Bible Nso

1 Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 14:1
37 Iomraidhean Croise  

Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.


M'we si, Ọriam ka nka bu; Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu.


I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n'arum ka aru nādighi obim ike.


Ya mere mb͕e Jisus huru ya ka ọ nākwa ákwá, na ndi-Ju ndi soro ya bia ka ha nākwa kwa ákwá, Ọ su udè nime mọ-Ya, me kwa ka obi lọ Ya miri,


Ub͕u a ka nkpuru-obim nālọ miri; gini ka M'gēkwu kwa? Nna, zọputam n'oge hour nka. Ma n'ihi nka ka M'biaruru oge hour nka.


Jisus we tie nkpu, si, Onye kwere na Mu, ọ bughi na Mu ka o kwere, kama ọ bu n'Onye ziterem.


Site n'ub͕u a anamagwa unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere na Mu onwem bu Ya mb͕e ọ bula ọ gēru.


Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.


Ihe ndia ka ha gēme kwa, n'ihi na ha amaghi Nnam, ha amaghi kwa Mu.


Kama n'ihi na M'gwawo unu okwu ndia, ihe-nwuta ejuputawo obi-unu.


ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya.


N'ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.


ya mere, kama ibara ya nba ọzọ anamachọ ka unu were amara b͕aghara ya kasi kwa ya obi, ka aghara iji ihe-nwuta nke nēwutabiga ya ókè loda madu di otú a n'uzọ ọ bula.


N'ihi nka mu onwem kwa, ebe m'nuru okwu bayere okwukwe di nime unu nke unu kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile,


ka ewe ghara isite n'aka mọ, ma-ọbu okwu, ma ọbu akwukwọ-ozi di ka o sitere n'aka-ayi, me ka unu me nkpatu pua n'uche-unu ọsọsọ, ma-ọbu ka unu tua ujọ, dika agāsi na ubọchi Onye-nwe-ayi di ub͕u a:


ndi sitere n'aka-Ya buru ndi kwere na Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, we nye Ya ebube; ka okwukwe-unu na olile-anya-unu we di n'ebe Chineke nọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan