Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 13:4 - Bible Nso

4 O bilie na nri-anyasi, wusa uwe-Ya, we chiri ákwà anēji hicha aru, we ke Onwe-ya n'úkwù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 13:4
9 Iomraidhean Croise  

Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ ebe a, ka ayi we jua Jehova ase site n'aka-ya? Otù nime ndi-orù eze Israel we za, si, Elaisha nwa Shefat nọ ebe a, onye wukwasiri miri n'aka Elaija.


Ngọzi nādiri ndi-orù ahu, ndi, mb͕e onye-nwe-ha gābia, ọ gāhu ka ha nēche nche: n'ezie asim unu, na ọ gēke onwe-ya ihe-ọkiké n'úkwù, me ka ha nọdu na nri, ọ gābia kwa jere ha ozi.


Ma ònye n'etiti unu, asi na o nwere orù nke nālu ọlu ubi ma-ọbu nke nāzù aturu, gāsi ya, mb͕e o si n'ubi bata n'ulo, Bia ngwa ngwa nọdu na nri;


nke nāgaghi-asi kwa ya kama nke ahu, Dozie ihe m'gēri na nri-anyasi, ke kwa ihe-ọkiké n'úkwù-gi, nējerem ozi, rue mb͕e m'risiri ṅu kwa; ma emesia gi onwe-gi gēri ṅu kwa?


N'ihi na ònye ka ibe-ya uku, onye nānọdu na nri, ma-ọbu onye nēje ozi? ọ̀ bughi onye nānọdu na nri? ma Mu onwem di n'etiti unu ka onye nēje ozi.


Ya mere mb͕e Ọ sasiri ukwu-ha, chiri kwa-uwe Ya, nọdu kwa ala ọzọ, Ọ si ha, Ùnu mara ihe M'meworo unu?


N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya.


N'ihi na nka bu ozi ahu unu nuru site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan