Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 13:3 - Bible Nso

3 Jisus, ebe Ọ matara na nna-Ya nyere Ya-ri ihe nile n'aka, na O si-kwa-ra n'ebe Chineke nọ puta, nālakuru kwa Chineke,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. Ọ maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 13:3
22 Iomraidhean Croise  

Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.


Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem.


Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mara Onye Ọkpara ahu bu, ma-ọbughi Nna-Ya; na Onye Nna ahu bu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.


Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu.


Ma mb͕e ememe ngabiga akērughi, ebe Jisus matara na oge hour Ya abiawo ka O si n'uwa nka lakuru Nna-Ya, ebe Ọ huru ndi nke aka Ya nọ n'uwa n'anya, Ọ huru ha n'anya rue ogwugwu ihe nile.


dika I nyere Ya ike n'ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi.


Ọ dighi kwa onye ọ bula rigoworo n'elu-igwe, ma-ọbughi Onye siri n'elu-igwe ridata, bú Nwa nke madu.


Nna nāhu Ọkpara-Ya n'anya, O nyewo kwa Ya ihe nile n'aka.


Mu onwem matara Ya; n'ihi na esim n'ebe Ọ nọ bia, Ya onwe-ya zite-kwa-ram.


Ya mere Jisus siri, Ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ, M'we lakuru Onye ziterem.


Jisus zara, si ha, Asi kwa na Mu onwem b͕ara Onwem àmà, àmà nkem bu ezie; n'ihi na amataram ebe M'siri bia, na ebe M'nāla; ma unu onwe-unu amataghi ebe M'si bia, ma-ọbu ebe M'nāla.


Jisus siri ha, Ọ buru na Chineke bu Nna-unu, unu gāhum n'anya: n'ihi na Mu onwem siri n'ebe Chineke nọ puta we bia; n'ihi na abiaghm n'Onwem, kama Ya onwe-ya ziterem.


Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe.


N'ihi na, Ihe nile ka O doro n'okpuru ukwu-Ya abua. Ma mb͕e ọ bula O gēkwuwori, si, Edowo ihe nile n'okpuru Ya, ọ putara ìhè na Ọ nọghi ya, bú Onye doro ihe nile n'okpuru Ya.


Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan