Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 13:10 - Bible Nso

10 Jisus si ya, Onye asaworo aru, nkpà isa aru ọzọ adirighi ya ma-ọbughi isa ukwu-ya, kama aru-ya dum di ọcha: unu onwe-unu di kwa ọcha, ma ọ bughi unu nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, ọ bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama ọ bụghị unu niile.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 13:10
23 Iomraidhean Croise  

N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.


I mazuru nma, eyìm; Ọ dighi kwa ntupọ di n'aru-gi.


N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n'ihi na M'gāb͕aghara ndi M'nēme ka ha fọdu nmehie-ha.


Onye nēzilaga nkpi ka ọ buru ewu-ọpupu gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.


Onye nēsure ha ọku gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.


B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ.


Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M'rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem.


Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ bughi nání ukwum, kama akam abua kwa na isim.


Ub͕u a unu onwe-unu di ọcha n'ihi okwu nke M'gwaworo unu.


Ya mere ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekère ọhu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu.


Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.


Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke.


Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n'uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


ebe ha bu nání (ha na ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na ime-baptism di iche iche) ihe di iche iche nke anu-aru aguru n'ihe ziri ezi, enyere n'iwu rue oge imezi ihe.


N'ihi na ayi nile nāsu ngọngọ n'ọtutu ihe. Ọ buru na onye ọ bula asughi ngọngọ n'okwu, onye ahu bu nwoke tozuru okè, buru kwa onye puru ikwa aru-ya dum nga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan