30 Jisus zara, si, Ọ bughi n'ihim ka olu a daworo, kama ọ bu n'ihi unu.
30 Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu.
Anamaṅuri kwa ọṅu n'ihi unu na adighi m n'ebe ahu, ka unu we kwere; otú ọ di, ka ayi jekuru ya.
Ma Mu onwem matara na I nānu olum mb͕e nile: ma n'ihi ìgwè madu a nke guzoro gburugburu ka M'kwuru ya, ka ha we kwere na ọ bu Gi onwe-gi ziterem.
Ub͕u a ka ikpé uwa nka di: ub͕u a ka agāchupu onye-isi uwa nka.
Ma àmà nke Mu onwem nānara esighi n'ọnu madu puta: otú ọ di, ihe ndia ka M'nēkwu, ka ewe zọputa unu.
N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya.