Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 12:16 - Bible Nso

16 Ihe ndia ndi nēso uzọ-Ya amaghi na mbu: kama mb͕e enyereri Jisus otuto, mb͕e ahu ka ha chetara na edereri ihe ndia bayere Ya n'akwukwọ nsọ, na ha me-kwa-ra Ya-ri ihe ndia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 12:16
19 Iomraidhean Croise  

Ya mere, otú a, mb͕e Ọ gwasiri ha okwu, ewe kuru Onye-nwe-ayi Jisus rigo n'elu-igwe, O we nọdu n'aka-nri nke Chineke.


Ma ha aghọtaghi okwu ahu, ha nātu kwa egwu iju Ya.


Ma ndi ahu aghọtaghi ihe ọ bula n'ihe ndia; ezonari-kwa-ra ha okwu a, ha amaghi kwa ihe anēkwu.


Ya onwe-ya we si ha, Unu ndi nēnweghi uche, ndi di kwa urè n'obi ikwere n'ihe nile ndi-amuma kwuru!


Mb͕e ahu ka O meghere uche-ha, ka ha we ghọta ihe edeworo n'akwukwọ nsọ;


Ma ha aghọtaghi okwu a, ọ bu kwa ihe ezonariwori ha, ka ha ghara inuta ya: ha nātu kwa egwu iju Ya ajuju bayere okwu a.


Jisus we za ha, si, Oge hour abiawo, ka ewe nye Nwa nke madu otuto.


Ma Onye-nkasi-obi ahu, bú Mọ Nsọ, Onye Nnam gēzite n'aham, Onye ahu gēzí unu ihe nile, me kwa ka unu cheta okwu nile Mu onwem gwara unu.


Ma okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka, mb͕e ọ bula oge hour ha gābia, ka unu we cheta ha, na Mu onwem gwara unu. Ma agwaghm unu okwu ndia site na mbu, n'ihi na Mu na unu nọri.


Nna, Gi onwe-gi were kwa otuto nke M'nwere n'ebe I nọ mb͕e uwa akādighi nyem otuto ub͕u a nebe Gi onwe-Gi nọ.


Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru.


Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n'ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n'ihi na akēnyeghi Jisus otuto.


Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n'aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n'aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa.


Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe.


Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n'iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya.


nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.


Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan