Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 12:1 - Bible Nso

1 Ya mere mb͕e ubọchi isi fọduru ka ememe ngabiga rue, Jisus biaruru Betani, ebe Lazarọs nọ, onye Jisus mere ka o si na ndi nwuru anwu bilie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ụbọchị isii tupu e mee Mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani bụ obodo Lazarọs, onye ahụ ọ mere ka o site nʼọnwụ bilie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 12:1
13 Iomraidhean Croise  

O we rapu ha, si n'obodo ahu pua je Betani, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.


O we ba Jerusalem, n'ulo uku Chineke; mb͕e O lesiri ihe nile anya buruburu, ebe ọ bu mb͕e anyasi ub͕u a, O we pua je Betani, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu.


O we dupu ha rue n'uzọ Betani: O we chilie aka-Ya elu, gọzie ha.


Ma le, otù nwanyi nke nọ n'obodo ahu, bú onye-nmehie; mb͕e ọ mara nke-ọma na Ọ nọduru na nri n'ulo onye-Farisi ahu, o we weta ite alabaster nke manu-otite di ya nime,


Ma aru otù nwoke adighi ike, bú Lazarọs onye Betani, onye sitere n'obodo ntà Meri na Mata nwa-nne-ya nwanyi.


Ma mb͕e O kwusiri ihe ndia, O were oké olu tie nkpu, si, Lazarọs, puta n'èzí.


Onye nwururi anwu putara, ewerewori ákwà-ozu ke ya ukwu na aka; were kwa ichafọ kechie ya iru. Jisus si ha, Tọpunu ya, ghara kwa ya ka ọ la.


Ma ememe ngabiga nke ndi-Ju di nso: ọtutu madu we si n'ala ndi-Ju rigoro Jerusalem mb͕e ememe ngabiga ahu akērughi, ime onwe-ha ka ha di ọcha.


N'echi-ya oké ìgwè madu nke biara ememe ahu, mb͕e ha nuru na Jisus nābia Jerusalem,


Ma ndi-Grik ufọdu di n'etiti ndi nārigo ka ha kpọ isi ala nye Chineke n'ememe ahu:


Ya mere ọra madu n'etiti ndi-Ju mara na Ọ nọ n'ebe ahu: ha we bia, ọ bughi n'ihi nání Jisus, kama ka ha we le kwa Lazarọs, onye Ọ mereri ka o si na ndi nwuru anwu bilie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan